bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 16
Acts 16
Igbo 1988
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 17 →
1
Mgbe ahụ, Pọl na Saịlas buru ụzọ jeruo obodo Debi. Emesịa ha gara nꞌobodo Listra, ebe ha zutere otu nwoke a na-akpọ Timoti. Timoti bụ onye kwere ekwe. Nne ya bụ onye Juu, bụrụkwa onye kwere ekwe. Ma nna ya bụ onye Griik.
2
Ụmụnna nꞌime Kraịst bi nꞌobodo Listra na Aikoniọm gbara ezi ama banyere Timoti.
3
Nꞌihi nke a Pọl rịọrọ ka Timoti soro ya nꞌije ya. Ma nꞌihi ndị Juu bi nꞌakụkụ ahụ, Pọl biri Timoti ugwu tupu o soro ha. Nꞌihi na mmadụ nile maara na nna Timoti bụ onye Griik.
4
Ha jegharịrị nꞌobodo dị iche iche na-akọwara nzukọ Kraịst ihe banyere mkpebi ndị ozi na ndị okenye kpebiri na Jerusalem banyere ndị mba ọzọ.
5
Ihe ndị a nile mere ka nzukọ Kraịst too eto nꞌokwukwe na nꞌọnụ ọgụgụ.
6
Mgbe ha si nꞌebe ahụ pụọ, ha gara nꞌobodo Frigia na Galetia. Ma Mmụọ Nsọ ekweghị ka ha kwusaa ozi ọma nꞌakụkụ Esia nꞌoge ahụ.
7
Mgbe ha ruru nꞌakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nꞌakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ Onyenwe anyị akwagideghị ka ha gaa.
8
Kama ha chigharịrị ihu gaa nꞌakụkụ obodo Misia. Emesịa, ha batara nꞌobodo Troas.
9
Nꞌabalị ahụ Pọl hụrụ ọhụ. Nꞌime ọhụ ahụ, ọ hụrụ otu nwoke ka o guzo na-arịọ Pọl arịrịọ sị ya, “Biko, bịa na Masidonia nyere anyị aka.”
10
Site nꞌoge Pọl hụrụ ọhụ a, anyị bidoro ịkwado ịga Masidonia. Nꞌihi na anyị kpebiri na ọ bụ Chineke na-eziga anyị nꞌebe ahụ. Anyị matakwara na ọ bụ ọchịchọ ya ka anyị kwusaa ozi ọma ya nꞌebe ahụ.
11
Ọzọ kwa, anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas. Emesịa, anyị gafere obodo Samotres. Nꞌechi ya, anyị bịaruru Niapolis.
12
Nꞌikpeazụ, anyị bịaruru obodo Filipai nke dị nꞌime ala Masidonia. Filipai bụkwa obodo dị nꞌokpuru ndị Rom. Anyị nọgidere nꞌebe ahụ ụbọchị ụfọdụ.
13
Nꞌụbọchị izuike, anyị sitere nꞌobodo ahụ gaa nꞌakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụfọdụ mmadụ na-ezukọ ikpe ekpere. Nꞌebe a ka anyị nọ kụziere ọtụtụ ụmụ nwanyị bịara ikpe ekpere okwu Chineke.
14
Aha otu nꞌime ndị inyom a bụ Lidia. Ọ bụ onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Amụrụ ya nꞌobodo Tiatira. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Mgbe ọ nọ na-ege ntị nꞌihe Pọl na-ekwu, Chineke meghere obi ya, mee ka ọ nabata okwu nile Pọl kwuru.
15
E mere ya na ezinụlọ ya baptizim. Lidia rịọrọ ka anyị bụrụ ọbịa nꞌụlọ ya. Ọ gwara anyị okwu sị, “Ọ bụrụ nꞌezie na unu gụrụ m dị ka onye kwesịrị ntụkwasị obi, biko batanụ nꞌụlọ m.” Mgbe ọ kwagidesịrị anyị ike, anyị sooro ya.
16
Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga ikpe ekpere nꞌakụkụ ọnụ mmiri, anyị zutere otu nwagbọghọ onye mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya. Ọ bụkwa ohu, na onye na-agba aja. Site nꞌụzọ dị otu a ọ na-ewetara ndị nwe ya ego dị ukwuu.
17
Ma o sogidere anyị ebe ọ bụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-sị, “Ndị a bụ ndị ozi Chineke kachasị ihe nile elu. Ha abịala nꞌebe a ikwusara unu ihe banyere ụzọ mgbaghara mmehie.”
18
Nwagbọghọ ahụ mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nꞌoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nꞌime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nꞌime nwagbọghọ a pụta!” Otu mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime ya pụta.
19
Mgbe ndị nwe nwagbọghọ ahụ hụrụ na olileanya inweta ego site nꞌịgba aja agwụla, ha sitere nꞌoke ọnụma jide Pọl na Saịlas dọkpụrụ ha jekwuru ndị ikpe nꞌebe a na-azụ ahịa.
20
Ha nile tiri mkpu sị, “Ndị Juu a emebiela obodo ukwu anyị!
21
Ha na-ezi ọtụtụ mmadụ ka ha mee omume megidere iwu ndị Rom!”
22
Mgbe na-adịghị anya, ha kwalitere obi ọtụtụ mmadụ megide Pọl na Saịlas. Ndị ikpe ahụ nyere igwe mmadụ ahụ ike ịdọkasị uwe Pọl na Saịlas, na itikwa ha ihe.
23
Mgbe ha tichara ha ihe, a tụnyere ha nꞌime ụlọ mkpọrọ. E mekwara ka onye nche mata na o kwesịrị iche ha nche nke ọma.
24
Nꞌihi nke a, onye nche kpachapụrụ ha anya nke ọma, tinye ha nꞌime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri eriri igwe kegide ha nꞌụkwụ.
25
Nꞌetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị nile nọ nꞌụlọ mkpọrọ ahụ na-anụkwa olu ha.
26
Na mberede, ala ọma jijiji bidoro, ntọ ala ụlọ mkpọro ahụ gharịpụrụ nꞌọnọdụ ya. Ọnụ ụzọ ya nile meghekwara. Mkpọrọ igwe nile e ji kee ndị mkpọrọ dapụsịrị site nꞌebe e kegidere ha!
27
Mgbe ahụ, onyeisi nche ụlọ mkpọrọ ahụ tetara nꞌụra. Ọ hụrụ na ọnụ ụzọ nile ghere oghe. Nꞌihi ya o chere na mmadụ nile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya.
28
Ma Pọl tiri mkpu sị ya, “Egbula onwe gị. Anyị nile nọ nꞌebe a!”
29
Onyeisi nche ahụ tụrụ egwu nke ukwuu maakwa jijiji. Ọ kpọrọ ka e tinye ọkụ. Mgbe e tinyesịrị ọkụ, ọ gbaara ọsọ daa nꞌụkwụ Pọl na Saịlas.
30
Ọ kpọpụtara ha, rịọ ha sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?”
31
Ha sịrị ya, “Kwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinụlọ gị nile.”
32
Ha kọọrọ ya na ndị ezinụlọ ya akụkọ ozi ọma Onyenwe anyị.
33
Nꞌoge ahụ, ọ sara ọnya ha, nꞌebe e tichara ha ihe, ma merụọ ha ahụ. Emesịa, e mere ya na ezinụlọ ya baptizim.
34
Ọ kpọbatara ha nꞌụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi na ha kweere na Chineke.
35
Nꞌechi ya, ndị ikpe ahụ ziri ndị uwe ojii ka ha gwa onyeisi nche ụlọ mkpọrọ ahụ ka ọ hapụ Pọl na Saịlas ka ha laa.
36
Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa.
37
Ma Pọl zara sị, “Mbaa! Nke a abụghị ihe ha kwesịrị ime! Ha tiri anyị ihe nꞌihu mmadụ nile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nꞌụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nꞌobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesịri ka ha bịa nꞌonwe ha kpọpụta anyị!”
38
Ndị uwe ojii ahụ e ziri ozi gara gwa ndị ikpe ahụ ihe Pọl kwuru. Mgbe ha nụrụ na Pọl na Saịlas bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu.
39
Ha bịakwutere ha nꞌụlọ mkpọrọ rịọsie ha arịrịọ ike sị ha laa. Ha kpọpụtakwara ha, rịọ ha ka ha hapụ obodo ahụ.
40
Mgbe ahụ Pọl na Saịlas laghachiri nꞌụlọ Lidia. Ọtụtu ndị kwere ekwe bịakwutere ha. Pọl na Saịlas gwara ha okwu Chineke. Emesịa, ha hapụrụ obodo ahụ.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28