bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 23
Acts 23
Igbo 1988
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 24 →
1
Mgbe Pọl lekwasịrị ndị nzukọ a anya, o kwuru okwu sị, “Ụmụnna m, akọnụche m amaghị m ikpe banyere ndu m nꞌihu Chineke.”
2
Nꞌihi okwu a o kwuru, Ananayas onyeisi nchụaja nyere iwu ka ndị nọ Pọl nso pịa ya aka nꞌọnụ.
3
Ma Pọl, na-atụghị ụjọ, gwara Ananayas okwu sị, “Otu a ka Chineke ga-esi pịa gị aka nꞌọnụ, gị onye dị ka mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nꞌonwe gị site nꞌinye iwu ka e si otu a tie m ihe?”
4
Ndị guzo Pọl nso jụrụ ya sị, “Ọ̀ bụ otu a ka i si ekwuru onyeisi nchụaja Chineke okwu?”
5
Ma Pọl zara ha sị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m, na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ọ dịghị mma ikwu okwu ọjọọ megide ndị na-achị achị.”
6
Mgbe Pọl ghọtara na ndị bịara nzukọ ahụ dị ụzọ mmadụ abụọ, ndị Sadusii nꞌotu ụzọ, ndị Farisii nꞌụzọ nke ọzọ, o tiri mkpu sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii. Nna m bụkwa onye Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nꞌihi okwukwe m nwere na mbilite nꞌọnwụ dị.”
7
Mgbe o kwusịrị nke a nzukọ ahụ kewara abụọ. Ndị Farisii na ndị Sadusii bidoro ise okwu. Nkewa dị ukwuu dịkwara nꞌetiti ha.
8
Nꞌihi na ndị Sadusii ekweghị na mbilite nꞌọnwụ ọ bụla dị. Ha ekwekwaghị na mmụọ ozi dị, ma ọ bụ na mmụọ ọ bụla dị nꞌime anyị. Ma ndị Farisii kweere nꞌihe ndị a.
9
Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nꞌotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nꞌoke olu sị, “O nweghị ihe ọjọọ anyị chọpụtara nwoke a mere. Ma eleghị anya ọ ga-abụ na mmụọ ma ọ bụ mmụọ ozi gwara ya okwu nꞌụzọ Damaskọs ahụ.”
10
Esemokwu ha bara ụba nke ukwuu. Nꞌihi ya ha bidoro ịdọkpụgharị Pọl nꞌakụkụ nile. Nꞌikpeazụ, ọchịagha tụru egwu na ha ga-emerụ Pọl ahụ ma ọ bụ gbuo ya. Ya mere o nyere iwu ka ndị agha ya jiri ike wepụta Pọl, ka ha kpọlaa ya nꞌụlọ ebe a na-edebe ngwa agha.
11
Nꞌabalị ahụ, Onyenwe anyị bịakwutere Pọl gwa ya sị, “Atụla egwu Pọl, nꞌihi na dị ka i si gwa ha okwu nꞌebe a otu a ka ị ga-emekwa na Rom.”
12
Nꞌechi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu na ha agaghị eri nri ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla tutuu ruo mgbe ha gburu Pọl.
13
Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a ruru iri mmadụ anọ.
14
Emesịa, ha jekwuuru ndị isi nchụaja kọọrọ ha ihe ha na-ezube ime. Ha gwara ha sị, “Anyị kwekọtara ịhapụ iri ma ọ bụ ịnụ ihe ọ bụla tutuu ruo mgbe anyị gburu Pọl.
15
Ugbu a, lee ihe anyị chọrọ ka unu meere anyị. Gwanụ ọchịagha ka ọ kpọpụta Pọl ọzọ nꞌihi na unu chọrọ ka nzukọ kpee ya ikpe. Meenụ dị ka unu nwere ajụjụ dị mkpa unu chọrọ ịjụ ya. Anyị ga-ejikere igbu ya nꞌụzọ.”
16
Ma nwa nwanne Pọl nụrụ maka izuzu ọjọọ a. Ọ bịakwara nꞌebe e dotere Pọl kọọrọ Pọl.
17
Pọl kpọrọ otu nꞌimen dị isi agha ahụ gwa ya sị, “Biko kpọrọ nwantakịrị a gaa nꞌebe ọchịagha nọ, o nwere okwu dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ya.”
18
Nwoke a kpọọrọ nwanta ahụ jekwuru ọchịagha gwa ya sị, “Pọl kpọrọ m rịọ m ka m kpọtara gị nwanta a nꞌihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.”
19
Ọchịagha ahụ duuru nwanta ahụ nꞌaka ya gaa nꞌakụkụ ọzọ jụọ ya sị, “Gịnị bụ mkpa gị, nwa m?”
20
Nwanta ahụ sịrị, “Echi na-abịa abịa, ndị Juu ga-agwa gị ka ị kpọpụtara Pọl nꞌụlọ ikpe. Ha ga-eme dị ka ha nwere ihe dị mkpa ha chọrọ ịjụta ya.
21
Ma aṅala ha ntị. Nꞌihi na ihe dị ka iri mmadụ anọ ga-ezo onwe ha na-eche mpụta unu. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla tutuu Pọl abụrụ onye nwụrụ anwụ.”
22
Ọchịagha ahụ gwara nwanta ahụ okwu sị, “Emekwala ka onye ọ bụla mata na ị bịara gwa m ihe dị otu a.”
23
Mgbe e mesịrị, ọchịagha ahụ kpọrọ mmadụ abụọ nꞌime ndị isi agha nye ha iwu sị,
24
“Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ. Ndị a ga-aga Sizaria nꞌelekere toolu nke abalị a. Họpụtakwa narị ndị na-ama ube abụọ na iri ndị na-agba inyinya asaa. Nyekwa Pọl inyinya nke ọ ga-agba, ma mee ka o rute nꞌebe Feliks onye na-achị akụkụ a nọ nꞌudo.”
25
Ọchịagha ahụ deere Feliks akwụkwọ sị ya,
26
“Site nꞌaka Kladiọs Lisias, ruo nꞌaka Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị. Ana m ekele.
27
“Ndị Juu jidere nwoke a chọọ igbu ya. Ma egbochiri m nke a mgbe m zipụrụ ndị agha ka ha napụta ya. Ahụkwara m na ọ bụ onye Rom.
28
Achọrọ m ịmata ebubo ha ga-ebo ya, nꞌihi ya eduuru m ya gaa nꞌọgbakọ ha ka ha tụọ ya mmehie ya nꞌihu.
29
Ma na-atụfughị mgbe achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere okwukwe ndị Juu. Nꞌeziokwu o nweghị ihe ọ bụla kwesịrị mkpọrọ ma ọ bụ onwụ nꞌime ya.
30
Ma mgbe m nụrụ ihe banyere izuzu ọjọọ ha na-agba ịla ndụ ya nꞌiyi, ekpebiri m izitere gị ya ka ọ dịrị ndị na-ebo ya ebubo mfe ikwu ihe o mere nꞌihu gị.”
31
Ya mere, nꞌabalị ahụ, ndị agha dubatara Pọl na Antipatris.
32
Nꞌụtụtụ echi ya ndị agha ji ụkwụ lọghachiri Jerusalem, ma ndị na-agba inyinya duuru Pọl bata Sizaria.
33
Ha duuru Pọl jekwuru Feliks onyeisi obodo ahụ. Mgbe ha rutere ha nyekwara Feliks akwụkwọ ahụ Lisias dere.
34
Feliks gụrụ akwụkwọ ahụ jụọ Pọl akụkụ obodo o si. Pọl zara gwa ya na ọ bụ Silisia.
35
Emesịa Feliks gwara Pọl okwu sị, “Aga m enye okwu gị ezi ohere mgbe ndị na-ebo gị ebubo bịara.” Feliks nyekwara iwu ka e tinye Pọl nꞌụlọ mkpọrọ dị nꞌobi eze Herọd.
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 24 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28